1 Samuel 17:52 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndikom Israel na Juda we bilie, tie nkpu, chua ndi Filistia, rue ebe i nābà Gai, ru kwa ọnu-uzọ-ama Ekron. Ndi Filistia ndi emeruru aru we da n'uzọ Shaaraim, we rue Gat, ru kwa Ekron.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn.