1 Samuel 18:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl gwara Devid okwu sị ya, “Lee ada m nwanyị Merab. Aga m akpọnye gị ya, ka ị lụọ ya. Naanị jeere m ozi, lụọkwa agha Onyenwe anyị.” Nʼihi na Sọl kwuru nʼime obi ya sị, “Agaghị m ewelite aka m megide ya. Ka ndị Filistia mee nke ahụ.”