1 Samuel 2:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.