1 Samuel 20:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jonatan we si Devid, Jehova, bú Chineke Israel, Ya buru onye-àmà; mb͕e m'gēnyochata obi nnam dika mb͕e a echi, ma-ọbu nwa-nne-echi, ma, le, ọ di nma n'ebe Devid nọ, #m'gaghi-ezite-kwa-ra gi ozi, we kpughepu nti-gi ka i nu ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata.