1 Samuel 20:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m Onyenwe anyị na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.”