1 Samuel 21:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n'ihi na ọ dighi achicha di n'ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n'iru Jehova, idọba achicha di ọku n'elu table n'ubọchi ewepuru ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe nri ọzọ na-adịghị, onye nchụaja ahụ nyere Devid achịcha nsọ, bụ achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, nke ewepụtara site nʼihu Onyenwe anyị nʼime ebe ịchụ aja, debekwa achịcha ọhụrụ nke e ji gbanwee nke ochie dị nʼebe ahụ.