1 Samuel 22:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Sọl we si ya, N'ìhi gini ka unu kekọtaworo onwe-unu imegidem, gi onwe-gi na nwa Jesi, n'inye ya achicha na mma-agha, na n'ijuru ya ase n'aka Chineke, ka o we bilie imegidem, iche anwu, dika ta?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl jụrụ ya sị, “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaa izu imegide m? Gịnị mere i ji nye ya nri na mma agha, jụkwaara ya ase site nʼaka Chineke? Gịnị mere i ji na-agba ya ume ka o nupu isi nʼebe m nọ, na ka ọ bịakwa nʼebe a imegide m taa?”