1 Samuel 22:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ̀ bu ta ka m'malitere ijuru ya ase n'aka Chineke? ya burum ihe-árú: ka eze ghara ibo orù-ya ebubo ọ bula, ghara kwa ibo ulo nnam nile: n'ihi na orù-gi amaghi ihe ọ bula n'ihe a nile, nke di ntà ma-ọbu nke di uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.”