1 Samuel 22:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n'okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n'aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n'akuku ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a Sọl nụrụ na achọtala ebe Devid na ndị ikom na-eso ya nọ. Sọl, onye ji ùbe ya nʼaka nọdụrụ ala nʼokpuru osisi tamarisk nke dị nʼugwu dị na Gibea. Ndị ozi ya guzokwa gburugburu ya.