1 Samuel 22:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n'akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl gwara ha sị, “Geenụ ntị unu ndị ikom Benjamin! Ọ bụ unu niile ka nwa Jesi ga-enye ala ubi na ubi vaịnị? Ọ bụ unu niile ka ọ ga-eme ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha?