1 Samuel 24:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Sọl we chiri nnù ndikom asa na ọgu iri arọputara n'Israel nile, ọ je ichọ Devid na ndikom-ya n'elu oké nkume nke ewu-ọhia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa.