1 Samuel 25:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Samuel we nwua; Israel nile we chikọta onwe-ha, tiere ya aka n'obi, lìe ya n'ulo-ya na Rema. Devid we bilie, rida rue ọzara Peran.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.