1 Samuel 25:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.