1 Samuel 25:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma otù nwoke bi na Maon, nke ọlu ọ nālu di na Kamel; nwoke ahu di kwa nọ̄ uku, ọ nwe-kwa-ra nnù aturu asa na ọgu iri, na nnù ewu abua na ọgu iri: ọ we nọ n'ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya na Kamel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.