1 Samuel 25:28 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha Onyenwe anyị ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile.