1 Samuel 26:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Devid we were ube na ite miri site n'akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n'ihi na ha nile nāraru ura; n'ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra.