1 Samuel 26:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?”