1 Samuel 26:7 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid na Abishai we biakute ndi Israel n'abali: ma, le, Sọl nēdina n'ura n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, atugide-kwa-ra ube-ya n'ala n'akuku isi-ya: Abnea na ndi Israel nēdina kwa ya buruburu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra.