1 Samuel 27:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Devid emeghi ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ime ka ha ba na Gat, ọ si, Ka ha we ghara igosi ihe bayere ayi, si, Otú a ka Devid mere, otú a ka ọ ganēme kwa ubọchi nile o nēbi n'ọhia ndi Filistia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.