1 Samuel 28:15 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Samuel we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēkweghi ka m'nọdu ndu, ime ka m'rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n'arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n'aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m'we kpọ gi, ka i we me ka m'mara ihe m'gēme.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Samuel sịrị Sọl, “Gịnị mere i ji esogbu m, site na ịkpọlite m?” Sọl zara, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ndị Filistia na-ebuso m agha, ma Chineke esitekwala nʼebe m nọ wezuga onwe ya. Ọ naghị azakwa m ọzọ, maọbụ site na ndị amụma, maọbụ site na nrọ. Nʼihi ya ka m ji kpọọ gị, ịjụ gị ihe m ga-eme.”