1 Samuel 30:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ha we nye ya iberibe mbadamba fig, na uyọkọ abua nke nkpuru-vine amiri ami; o we rie, mọ-ya we laghachikute ya: n'ihi na o righi nri, ọ ṅughi kwa miri, ubọchi atọ ehihie na abali.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig, na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị.