1 Samuel 30:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid we biakute ọgu ndikom iri ahu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi ijeso Devid n'azu, ndi ha me-kwa-ra ka ha nọdu n'akuku miri-iyi Besoa: ha we puta izute Devid, na izute ndi ya na ha nọ: Devid we biarue nso ndi ahu, jua ha ajuju bayere udo-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere.