1 Samuel 30:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ònye gēge kwa unu nti n'okwu a? n'ihi na dika òkè nke onye nārida n'agha si di, otú a ka òkè nke onye nānọdu n'akuku ihe-ayi di: ha gēkekọ n'otù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.”