1 Samuel 31:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.