1 Samuel 31:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndikom Israel ndi nọ n'ofè ọzọ ndagwurugwu ahu, na ndi nọ n'ofè Jọdan, we hu na ndikom Israel ab͕alagawo, hu kwa na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo, ha we rapu obodo nile ha, b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.