1 Samuel 4:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi Filistia we bu agha, ewe tib͕ue Israel, ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya: oké ntib͕u uku we di; orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise, bú ndi ji ukwu eje, we dapu n'Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha.