1 Samuel 5:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we ziga, chikọta ndi-isi nile nke ndi Filistia, si, Zilaga ib͕e Chineke Israel, ka ọ laghachi kwa n'ebe-ya, ka o we ghara ime ka ayi na ndi-ayi nwua: n'ihi na ọb͕ub͕a-aghara nke ọnwu di n'obodo ahu nile; ọ di arọ́ nke-uku, bú aka Chineke, n'ebe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.