1 Samuel 6:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n'ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.” A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo Filistia si dị ise, unu ga-eziga onyinye oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile.