1 Thessalonians 1:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe anyị wetaara unu ozi ọma, unu eweghị ya dị ka okwu na-erijughị afọ, kama unu gere nnọọ ntị nke ọma. Okwu nile anyị gwara unu metụkwara mmụọ unu, nꞌihi na Mmụọ Nsọ mere ka unu ghọta nꞌezie na ihe anyị kwuru bụ eziokwu. Unu matakwara otu ndụ anyị si bụrụ ihe ilere anya nye unu, igosi unu na okwu anyị ji bịa bụ eziokwu.
Igbo 2006
na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu.