1 Thessalonians 1:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a unu esitela na ndụ unu mee ka ozi ọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Griis. Nꞌihi na ebe ọ bụla anyị gara anyị na-ahụ ndị na-agwa anyị ihe banyere okwukwe dị iche unu nwere. Anyị adịkwaghị agwa ndị mmadụ ihe banyere okwukwe unu.
Igbo 2006
N'ihi na okwu nke Onye-nwe-ayi esiwo n'aru-unu daputa udà, ọ bughi nání na Masedọnia na Akaia, kama n'ebe nile ọ bula okwukwe-unu n'ebe Chineke nọ aputawo ìhè; ya mere ọ dighi ayi nkpà ikwu okwu ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya.