1 Thessalonians 2:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi nke a, anyị ga-aga nꞌihu na-ekele Chineke ekele nꞌihi na mgbe anyị bịakwutere unu, unu anabataghị ozizi anyị dị ka ozizi nke aka anyị, kama unu nabatara ya dị ka ozizi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Otu a ka ọ dịkwa. Okwu ahụ bụ okwu Chineke. Ọ gbanweela ndụ unu, mgbe unu kweere ya.
Igbo 2006
Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya.