1 Thessalonians 2:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe unu kweere okwu ahụ, ụmụnna m, unu onwe unu ketara oke nꞌụdị ahụhụ nke ndị Kraịst nọ na Judia hụrụ mgbe ndị obodo unu bidoro ịkpagbu unu, dị ka ndị Juu si kpagbuo ndị Kraịst na Judia.
Igbo 2006
N'ihi na unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ghọrọ ndi nēṅomi nzukọ nile nke Chineke nke di na Judia nime Kraist Jisus: n'ihi na unu onwe-unu hu-kwa-ra otù ahuhu ahu n'aka ndi unu na ha bu otù ala, ọbuná dika ndi ahu huru ahuhu n'aka ndi-Ju;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu.