1 Thessalonians 2:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha na-agbalị igbochi anyị izisara ndị mba ọzọ ozi ọma ka ha ghara ichegharị. Ha na-esite nꞌụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịla ha rị ịla ha nꞌiyi.
Igbo 2006
Na-eb͕ochi ayi igwa ndi mba ọzọ okwu ka ewe zọputa ha; imezu nmehie nile ha mb͕e nile: ma iwe Chineke abiakwasiwo ha rue ọgwugwu-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha.