1 Thessalonians 2:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na olee ihe bụ olileanya anyị, ma ọ bụ okpu eze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi? Ọ bụ unu onwe unu. Ee, unu onwe unu ga-abụ ọṅụ anyị mgbe a ga-eme ka anyị nile guzo nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-esi nꞌeluigwe bịa ọzọ.
Igbo 2006
N'ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n'iru Onye-nwe-ayi Jisus n'ọbibia-Ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na olee ihe bụ olileanya anyị, maọbụ ọṅụ anyị, maọbụ okpueze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi mgbe a ga-eme ka anyị niile guzo nʼihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-abịa? Ọ bụ na ọ bụghị unu onwe unu?