1 Thessalonians 2:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Dị ka unu ga-echeta, anyị agwaghị unu ihe ọ bụla site nꞌọchịchọ nke na-adịghị ọcha, ma ọ bụ site nꞌobi nke aghụghọ dị. Kama anyị gwara unu ihe nile hoo haa, nꞌụzọ guzo ọtọ, nke eziokwu.
Igbo 2006
N'ihi na aririọ ayi nāriọ unu esighi na njehie puta, o sighi kwa n'adighi-ọcha, ọ bughi kwa n'aghughọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na arịrịọ anyị na-arịọ unu esiteghị na njehie pụta maọbụ nʼọchịchọ nke na-adịghị ọcha ma ọ bụkwanụ nʼaghụghọ.