1 Thessalonians 2:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na anyị na-ekwu okwu anyị dị ka ndị ozi Chineke họpụtara, ndị ọ tụkwasịrị obi ikwu eziokwu, tinye ọrụ ozi ọma a nꞌaka. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, Chineke ahụ na-enyocha echiche obi zoro ezo.
Igbo 2006
kama dika Chineke nwaputaworo ayi ka enye ozi ọma Ya n'aka-ayi na ntukwasi-obi idebe, otú a ka ayi nēkwu; ọ bughi dika ndi nēme ihe gātọ madu utọ, kama dika ndi nēme ihe gātọ Chineke utọ, bú Onye nānwa obi-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị.