1 Thessalonians 2:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ dịghị mgbe ọ bụla, dị ka unu maara, anyị ji ire ụtọ chọọ ime ka unu bụrụ ndị nke Kraịst. Chineke makwaara na anyị ejighị aghụghọ bịakwute unu ịrịọ ka unu bụrụ ndị enyi anyị nꞌihi na anyị chọrọ ịnata unu ego nꞌaka.
Igbo 2006
N'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ahuru ayi n'ikwu okwu nrafu, dika unu matara, ma-ọbu n'iwere aghughọ b͕achita anya-uku, Chineke bu onye-àmà;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị mgbe ọbụla, dị ka unu maara, anyị kwuru okwu nrafu maọbụ were ụzọ aghụghọ zoo anya ukwu anyị nwere. Chineke bụ onye akaebe anyị.