1 Thessalonians 2:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na anyị hụrụ unu nꞌanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị nanị na anyị kwusaara unu ozi ọma, kama anyị nyekwara unu onwe anyị.
Igbo 2006
otú a, ebe unu di ayi n'obi nke-uku, ọ diri ayi ezi nma ime ka unu keta, ọ bughi nání ozi ọma nke Chineke, kama ọ bu kwa nkpuru-obi nke aka ayi, n'ihi na emere ka unu buru ndi ayi huru n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na anyị hụrụ unu nʼanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị naanị na anyị kwusaara unu oziọma Chineke kama anyị nyekwara unu ndụ anyị. Nʼihi na unu dị anyị nʼobi nke ukwu.