1 Thessalonians 2:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌezie, ụmụnna m amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ nꞌetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nꞌihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọ bụla mgbe anyị na-ezisara unu ozi ọma nke Chineke.
Igbo 2006
N'ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu na ihuju-anya-ayi: n'ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie ụmụnna m, amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ hụjuokwa anya nʼetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nʼihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọbụla mgbe anyị na-ezisara unu oziọma Chineke.