1 Thessalonians 3:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nke a ga-eme ka Chineke Nna anyị nye unu obi siri ike, nke dị nsọ, na nke na-enweghị ntụpọ ọ bụla, ka unu nwee ike iguzo nꞌihu ya dị ka ndị a na-apụghị ịta ụta nꞌụbọchị ahụ Jisọs na ndị ya nile ga-alọghachi.
Igbo 2006
ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n'idi-nsọ n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.