1 Thessalonians 3:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ugbu a, Timoti esitela nꞌebe unu nọ lọghachikwute anyị. O mere ka anyị mata na okwukwe unu guzo chịm; o mekwara ka anyị mata na unu na-echeta anyị mgbe nile. Na ọ na-akpasị unu mkpa ike ịhụ anyị anya, dị ka o si akpa anyị mkpa ịhụ unu anya.
Igbo 2006
Ma mb͕e Timọti siri n'ebe unu nọ biakute ayi ọbuná ub͕u a, we zìe ayi ozi ọma bayere okwukwe na ihunanya unu, si kwa na unu nēcheta ayi ezi ncheta mb͕e nile, na agu ihu ayi anya nāgusi kwa unu ike, ọbuná dika ọ nāgu kwa ayi onwe-ayi ihu unu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya.