1 Thessalonians 4:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụmụnna anyị, unu nile amatala otu unu ga-esi bie ndụ na-atọ Chineke ụtọ, nꞌihi na unu amatala iwu ahụ si nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu.
Igbo 2006
Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa.