1 Thessalonians 4:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu ọ di ụmụnna anyị, achọrọ m ka unu mata ihe bụ ọnọdụ ụmụ Chineke, mgbe ha dara nꞌụra ọnwụ. Mgbe unu maara nke a unu agaghị abụ ndị na-anọ na mwute, ma ọ bụ unu adịrị dị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe mmadụ nwụrụ nꞌetiti unu.
Igbo 2006
Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n'ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya.