1 Thessalonians 4:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nꞌọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kraịst nile nwụrụ anwụ soro Jisọs lọghachi na ndụ.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ayi kwere na Jisus nwuru si kwa n'ọnwu bilie, otú a ndi emere ka ha da n'ura ọnwu site n'aka Jisus, ọ bu ndia ka Chineke gēkuru ka ha so Ya bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.