1 Thessalonians 4:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke achọkwaghị ka unu megbuo ibe unu site na nwoke iduru nwụnye onye ọzọ ka ha abụọ dinakọọ. Nꞌihi na Chineke ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ.
Igbo 2006
ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike.