1 Thessalonians 4:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesịrị ịdị nꞌetiti ụmụnna, o kwesịghị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nꞌihi na Chineke nꞌonwe ya na-ezi unu inwe ịhụnanya nꞌebe ibe unu nọ.
Igbo 2006
Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n'ebe umu-nna-unu nọ: n'ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n'anya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ.