1 Thessalonians 5:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna anyị, ka unu dọọ ndị ahụ nile aka na ntị, bụ ndị na-adịghị agazi ije ha, ha na ndị umengwụ. Kasienụ ndị ụjọ na-atụ obi. Lekọtazienụ ndị na-adịghị ike. Jirinụ ntachi obi na-anagideritanụ ibe unu nꞌime ịhụnanya.
Igbo 2006
Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.