1 Thessalonians 5:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na dị ka unu nile maara nke ọma, ọ dịghị onye maara mgbe ha ga-emezu. Onyenwe anyị ga-abịa mgbe a na-eleghị anya ya, dị ka onye na-ezu ohi si abịa mgbe a na-eleghị anya ya.
Igbo 2006
N'ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n'abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị.