1 Thessalonians 5:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọtụtụ mmadụ ga-asị, “Udo dị, ihe nile na-aga nke ọma,” mgbe ahụ, na mberede, ka oke ịla nꞌiyi dị egwu ga-adakwasị ha, ọ dịkwaghị otu onye ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ. Ihe mgbu ahụ ga-adị ka ihe mgbu na-adakwasị nwanyị ime na-eme.
Igbo 2006
Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.