1 Thessalonians 5:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka anyị nile, bụ ndị bi nꞌìhè bụrụ ndị anya doro, ndị ji okwukwe na ịhụnanya kpuchie onwe ha, na ndị yikwasịrị onwe anyị okpu igwe ahụ nke bụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị.
Igbo 2006
Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.